NTULERỊTA AGWA ỌJỌỌ, NTARAMAAHỤ HỤ NAMGBAGHARA N’IDUUAZỊ ATỌ NDỊ A HỌỌRỌ

Author

Chioma Blessing Onwubie, PhD

Ụmịedemede

N’ime mmadụ Chukwu kere, ọtụtụ ihe jupụtara n’ime ya nakwa
na ndụ ya, agwa ọma na agwa ọjọọ. N’ezie, Chukwu e keghị
mmadụ ka ọ kpawa agwa ọjọọ, mana n’ihi ndụ ọjọọ, omume
ọjọọ na atụmatụ ọjọọ jupụtara n’ime mmadụ ka mmadụ ji were
na-akpa agwa ọjọọ, na-ebi ndụ ọjọọ ma na-emekwa omume
ọjọọ. E nwere ọtụtụ ihe na-ebutekarị nsogbu ndị gụnyere:
anyaukwu, mkpọrọmaasị, asịrị, oke ọchịchọ, iwe, agụụ na
enweghị afọ ojuju. Ebumnuche nchọcha a bụ ka a kwụ sị agwa ọjọọ n’ọdịnihu site n’inye ntaramaahụhụ onye mere ihe ọjọọ ma
site n’otu aka ahụ gbaghara onye mejọrọ. Atụtụ e ji mee nchọcha
a bụ Atụtụ Ntaramahụhụ na mgbaghara nke na-akọwa mgbochi
na mkpọkọta na-emetụta onye mejọrọ ma nweghachi n’uju
mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Usoro a gbasoro bụ usoro nke
nkọwa bụ nchọcha nke gbasara ndụ mmadụ, agwa ndị mmadụ
na-akpa na ịmata echiche mmadụ banyere okwu akpụ n’ọnụ. Ihe
e jiri mee nchọcha a bụ akwụkwọ agụmagụ Igbo atọ ndị a họọrọ.
Ha bụ Omenụkọ nke Nwana (1933) Isi Akwụ Dara n’Ala nke
Ubesie (1973) na Agharata nke Ezikeojiakụ (2009) dere.
Nchọcha a gosiri n’eziokwu na mmadụ ikpa agwa ọjọọ adịghị
mma. Ọ na-ebutekarị nkọcha na ọnwụ. A chịkọtara nchọcha a
site n’ịkọ nkenke akụkọ gbasara akwụkwọ atọ a họọrọ ma
gosipụtakwa ndị kpara agwa ọjọọ n’ime ha, Nye ha
ntaramaahụhụ ma gbagharakwa ha nke a bụrụ ịdọ aka na ntị nye
ọhanaeze na onye ọ bụla wepụ aka ime ihe ọjọọ n’ihi na ndụ
adịghị n’ime ya.

Nkọwa Okwu ụfọdụ
Okwu Igbo

Agwa ndagharị round character
Agwa rarịị flat character
Ekereuche imagination/creativity
Ewetaeti episodic incidents Girisii Greece
Ndịnaya content
Nkamma aesthetics
Nnyocha Criticism
Ndokọ amọmakọ narrative structure
Nsiede written convention
Nsicha contrasting
Nsikwu comparing, comparism, comparative
Nsieme dramatic convention
Nsirihụ odee writer point of view
Ntụ cha agụ magụ literary analogy
Nnyocha agụ magụ literary criticism
Onyocha researcher
Obinkonelu suspence
Olu odee tone of the writer
ọdịdị form
ọdịnịgha prose

Leave a Comment

Your email address will not be published. Required fields are marked *