MMETỤTA NKWADO NDỊ NKUZI NA MMETANKE ỌMA ỤMỤ AKWỤKWỌ BEZIK DỊ ELUN’ASỤSỤ IGBO NA STEETI EBONYI

Author

Nwigwe Nwakaego
Department of Arts and Social Sciences Education,
Ebonyi State University, Abakaliki.
nwakaegonwigwe@gmail.com +2348033727159

Ụmịedemede

E mere nchọcha a iji chọpụta mmetụta nkwado ndị nkuzi
na mmeta nke ọma ụmụ akwụkwọ Bezik dị elu n’asụsụ
Igbo na steeti Ebonyi. Nchọcha a nwere ajụjụ atọ gbara
ọkpụrụkpụ, gbasokwa usoro nchọcha adịm nke nkọwasị.
Na nchọcha a, e nweghị ohere maka nsere n’ihi na e jiri
ọnụọgụ ndị nkuzi asụsụ Igbo niile nọ n’ogo
agụmakwụkwọ Bezik dị elu na steeti Ebonyi, nke dị
naanị otu nari na iri ano na isii (146), wee mee nchọcha
a. Ngwa e jiri mee nchọcha a bụ akwụkwọ njụmaza bụ
nke ihe e depụtara na ya dị iri abụọ na anọ (24) n’ime
ngalaba anọ. Maka inyocha nzuoke ngwa nchọcha, ndị
nkuzi abụọ na ngalaba amụmamụ asụsụ Igbo na otu onye
nkuzi na-akuzi na ngalaba ọtụtụ na nnw‡le
(measurement and evaluation) lebara anya na ya, bụ ndi
si na mahadum steeti Ebonyi. Ọchọcha lelere ịnọgide
n’ọnọdụ nke agbanweghị agbanwe site n’iji usoro ntụcha
njiatụle (data) a na-akpọ Cronbach Alpha n’olu Bekee,
ma e nwetara akara 0.97. E jiri ntụcha miin, ndipụ
n’izugbe (Sd) wee nweta ọsịsa nchọcha a. Nchọcha e
mere gosiri na ntozuoke ndị nkuzi na-emetụta mmeta
nke ọma ụmụ akwụkwọ Bezik dị elu n’asụsụ Igbo na steeti Ebonyi. Nchọpụta ọzọ gosiri na ahụmihe ndị nkuzi
nwere n’ọrụ ha na-emetụta mmeta nke ọma ụmụ
akwụkwọ Bezik dị elu n’asụsụ Igbo na steeti Ebonyi.
Nchọpụta nke ikpeazụ gosikwara na amamihe ndị nkuzi
nwere n’isiokwu ha na-akuzi na-emetụta mmeta nke ọma
ụmụ akwụkwọ Bezik dị elu n’asụsụ Igbo na steeti
Ebonyi. Ọchọcha tụtara alo; ka ndị bọọdụ
agụmakwụkwọ nke sekọndiri gbalịa hụ na ọ bụ naanị ndị
nkuzi maara nke ekwe na-akụ na nkuzi na ọmụmụ asụsụ
na omenaala Igbo ka a ga-ewe n’ọrụ nkuzi Igbo.; ndị
ọchịchị (govmenti) ga na-achị kọbara ndị nkuzi ọmụmụ
ihe kwa mgbe kwa mgbe nke ga-eme ka ha na-amụta ihe
ọhụrụ;

Edensibia

Aidan, C.O(2018). How does society influence one’s
Retrieved 22nd May from: https:// www.qura.com. Howdoes-society-influence-one’s- behavior.
Akande, O(2020). Adventure education and resilience:
double – edged sword. Journal of
education and Outdoor Learning 1 ( 2), 35-42.
Cannon, P(2010). Assessing writing: principles and
practice of marking written English. London:
Edward.
Crow, L.D. na Crow, A(1990). Educational psychology.
Van Nostrand Reinhold. Company. New
York.
Fabian, T(2005). Influence of Teachers Attitude on
Students’ interest and performance in
Biology. In Uzo-uwani Local Government Area of
Enugu state. Fafunwa, A. B(1999). History of Education in
Nigeria..NPS Educational publishers Ltd
Federal Republic of Nigeria(1998, 2004, 2014).
National policy on Education..Lagos. NERDC.
Nwigwe, N(2021). Effectiveness of story telling on
reading comprehension and written
production of indigenous language (Igbo) learners in
primary school in Ebonyi state.
Journal of Education and practice, 12 (23), 37-
Okudo, A. R(2016). Nchocha maka mmetuta nzu oke ndi
nkuzi gbasara omụmụ asusu Igbo
n’uloakwukwo sekondiri. Igele Igbo Journal of Igbo
studies.
Uzo, U(2019). The construct of resiliences: A critical
evaluation and guideline for future work.
New York: cades publishers.
Yule, T. A(2002). Changes in status of an indigenous
languages in Education in Nigeria. Nigeria
Journal of curriculum.

Leave a Comment

Your email address will not be published. Required fields are marked *